6 N’afọ nke itoolu nke ọchịchị Hoshia, eze Asiria weghaara Sameria,+ dọrọkwa Izrel n’agha+ laa Asiria ma mee ka ha biri na Hela+ nakwa na Hebọ, nke dị n’akụkụ osimiri Gozan+ nakwa n’obodo dị iche iche nke ndị Midia.+
24 E mesịa, eze Asiria si na Babịlọn+ na Kuta na Ava+ na Hemat+ na Sefaveyim+ kpọta ndị mmadụ, meekwa ka ha bichie ụmụ Izrel n’obodo ndị dị na Sameria;+ ha wee malite iweghara Sameria, birikwa n’obodo ya dị iche iche.