31 “‘Unu echigharịkwurula ndị na-agba afa,+ unu ajụkwala ndị ọrụ ha bụ ịkọ ọdịnihu ase,+ ka ha ghara ime ka unu bụrụ ndị na-adịghị ọcha. Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.
27 “‘Ma nwoke ma ọ bụ nwaanyị nke nwere mmụọ ịgba afa ma ọ bụ mmụọ ịkọ ọdịnihu,+ a ghaghị igbu ya.+ A ga-eji nkume tụgbuo ya. Ọbara ya ga-adị ya n’isi.’”+
3 Samuel anwụwo, Izrel dum akwaworo ya ákwá arịrị ma lie ya na Rema bụ́ obodo ya.+ Ma Sọl emewo ka a ghara inwekwa ndị na-agba afa na ndị ọrụ ha bụ ịkọ ọdịnihu n’ala ahụ.+