8Ịlaịsha gwara nwaanyị ahụ o mere ka nwa ya dị ndụ ọzọ,+ sị: “Bilie, gị na ezinụlọ gị, gaa biri dị ka ọbịa n’ebe ọ bụla ị pụrụ ibi dị ka ọbịa;+ n’ihi na Jehova ekwuwo na ụnwụ ga-ada,+ ọ bụghị naanị nke ahụ, ọ ga-adị n’ala a ruo afọ asaa.”+
13 “Nwa nke mmadụ, ọ bụrụ na ala emehie m site n’ime omume ekwesịghị ntụkwasị obi,+ m ga-esetị aka m mee ya ihe, gbajisịa mkpara o ji ekonye achịcha,+ m ga-emekwa ka o nwee ụnwụ,+ bipụkwa mmadụ na anụ ụlọ na ya.”+