25 ndị eze ga-esi n’ọnụ ụzọ ámá obodo a na-abata,+ ha na ndị ha mere ndị isi. Ha ga-anọkwasị n’ocheeze Devid,+ nọrọkwa n’ụgbọ ịnyịnya nakwa n’elu ịnyịnya, ha na ndị ha ji mere ndị isi, ndị ikom Juda na ndị bi na Jeruselem; a ga-ebikwa n’obodo a ruo mgbe ebighị ebi.
4 N’ihi na ọ bụrụ na unu edebe okwu a, ndị eze, bụ́ ndị na-anọchi Devid n’ocheeze ya,+ ga-esi n’ọnụ ụzọ ámá ndị dị n’ụlọ a na-abata, ha ga-anọ n’ime ụgbọ ịnyịnya, nọkwasịkwa n’elu ịnyịnya, eze nke ọ bụla na ndị na-ejere ya ozi, tinyere ndị ya.”’+