12 Mgbe ụbọchị gị ga-ezu,+ ị ga-esoro nna nna gị hà dinaa,+ mgbe ahụ, m ga-eme ka mkpụrụ gị, nke ga-esi n’ahụ́ gị pụta, bilie mgbe ị nwụsịrị; m ga-emekwa ka alaeze ya guzosie ike.+
44 “Ma n’ụbọchị ndị eze ahụ,+ Chineke nke eluigwe+ ga-eme ka otu alaeze+ nke a na-agaghị ebibi ebibi malite ịchị.+ A gaghịkwa enyefe ndị ọ bụla ọzọ alaeze ahụ.+ Ọ ga-egwepịa alaeze ndị a niile, mee ka ha ghara ịdịkwa,+ ma ya onwe ya ga-adịru mgbe ebighị ebi;+
15 Mmụọ ozi nke asaa wee fụọ opi ya.+ Oké olu wee kwuo okwu n’eluigwe, sị: “Alaeze nke ụwa aghọwo alaeze nke Onyenwe anyị+ na nke Kraịst ya,+ ọ ga-achịkwa dị ka eze ruo mgbe niile ebighị ebi.”+