10 Mkpanaka eze agaghị esi na Juda pụọ,+ mkpara onye na-achị isi agaghịkwa esi n’agbata ụkwụ ya pụọ, ruo mgbe Shaịlo bịara;+ ọ bụkwa ya ka ndị dị iche iche ga-erubere isi.+
20 Jehova wee mezuo ihe o kwuru+ na m ga-anọchi Devid nna m, nọkwasịkwa n’ocheeze Izrel,+ dị nnọọ ka Jehova kwuru, nakwa na m ga-ewuru aha Jehova bụ́ Chineke Izrel ụlọ,+
7 Mgbasa ịchịisi ya+ na udo ya ga-agbasa agaghị enwe ọgwụgwụ,+ n’elu ocheeze Devid+ nakwa n’alaeze ya iji mee ka o guzosie ike+ nakwa iji jiri ikpe ziri ezi+ na ezi omume+ mee ka ọ dịgide, malite ugbu a ruo mgbe ebighị ebi. Ekworo Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-emezu ihe a.+
9 Ma ìgwè mmadụ ahụ, ma ndị na-aga ya n’ihu ma ndị na-eso ya n’azụ, nọ na-eti mkpu, sị: “Biko, zọpụta+ Nwa Devid!+ Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ nke na-abịa n’aha Jehova bụ!+ Zọpụta ya, biko, n’ebe kasị elu!”+