31 N’ihi na ọ bụ na Jeruselem ka ndị fọdụrụnụ ga-esi pụta,+ ọ bụkwa n’Ugwu Zayọn ka ndị gbapụrụ agbapụ ga-esi pụta.+ Ọ bụ ekworo+ Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-eme ihe a.
32 N’ihi na ọ bụ na Jeruselem ka ndị fọdụrụnụ ga-esi pụta,+ ọ bụkwa n’Ugwu Zayọn+ ka ndị gbapụrụ agbapụ ga-esi pụta. Ọ bụ ekworo Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-eme ihe a.+
22 “Ya mere, sị ụlọ Izrel, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Ụlọ Izrel, ọ bụghị n’ihi unu ka m ga-eme ya, kama ọ bụ n’ihi aha nsọ m nke unu metọrọ n’etiti mba dị iche iche unu batara.”’+