7 Mgbasa ịchịisi ya+ na udo ya ga-agbasa agaghị enwe ọgwụgwụ,+ n’elu ocheeze Devid+ nakwa n’alaeze ya iji mee ka o guzosie ike+ nakwa iji jiri ikpe ziri ezi+ na ezi omume+ mee ka ọ dịgide, malite ugbu a ruo mgbe ebighị ebi. Ekworo Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-emezu ihe a.+
17 O wee yiri ezi omume dị ka uwe agha,+ kpurukwa okpu agha nke nzọpụta n’isi ya.+ O yiiri uwe ịbọ ọbọ,+ werekwa ịnụ ọkụ n’obi kpuchie onwe ya dị ka uwe elu na-enweghị aka.+
13 M ga-awụpụ iwe m dum,+ m ga-emekwa ka ọnụma m nke m wụkwasịrị ha dajụọ,+ m ga-akasikwa onwe m obi;+ ha ga-amarakwa na mụ onwe m, Jehova, ekwuwo okwu n’ihi na m chọrọ ofufe a na-ekewaghị ekewa,+ mgbe m ga-awụkwasị ha ọnụma m dum.
14 mmụọ ozi ahụ nke nọ na-agwa m okwu wee gaa n’ihu ịsị m: “Jiri olu dara ụda kwuo, sị, ‘Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru: “Ana m ekwosiri Jeruselem na Zayọn ekworo ike.+