8 “Olee otú m ga-esi gbahapụ gị, Ifrem?+ Olee otú m ga-esi rara gị nye, Izrel?+ Olee otú m ga-esi mee ka ị dịrị ka Adma?+ Olee otú m ga-esi mee ka ị dịrị ka Zeboyim?+ Agbanwewo m obi m;+ n’otu mgbe ahụ, ọmịiko m ekporowo ọkụ.
2 Jehova bụ Chineke nke chọrọ ofufe a na-ekewaghị ekewa,+ bụrụkwa onye na-abọ ọbọ; Jehova na-abọ ọbọ,+ na-ewekwa iwe.+ Jehova ga-abọ ọbọ n’ahụ́ ndị iro+ ya, ọ na-eweso ndị iro+ ya iwe.