5 “Lee! Oge na-abịa,” ka Jehova kwuru, “mgbe m ga-eme ka ome ezi omume puoro Devid.+ Otu eze ga na-achị+ ma jiri ezi uche na-eme ihe, na-ekpekwa ikpe ziri ezi ma na-eme ezi omume n’ala a.+
13 Ya onwe ya ga-ewu ụlọ nsọ Jehova, ya onwe ya kwa ga-eburu ebube ya;+ ọ ga-anọdụ n’ocheeze ya wee na-achị, ọ ga-aghọkwa onye nchụàjà n’ocheeze ya,+ a ga-enwekwa nkwekọrịta+ n’ọrụ abụọ ahụ.
34 Ya mere, ìgwè mmadụ ahụ zara ya, sị: “Anyị nụrụ n’ime Iwu ahụ na Kraịst ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi;+ oleekwanụ otú i si na-asị na a ghaghị iweli Nwa nke mmadụ elu?+ Ònye ka Nwa nke mmadụ a bụ?”+
16 “‘Mụ onwe m, bụ́ Jizọs, zigara mmụọ ozi m ka ọ gbaara unu àmà banyere ihe ndị a maka ọgbakọ ndị a. Abụ m mgbọrọgwụ+ Devid, bụrụkwa nwa ya.+ Abụkwa m kpakpando ụtụtụ nke na-enwu gbaa.’”+