2 Otú ọ dị, Jehoshiba+ bụ́ ada Eze Jehoram, ya bụ, nwanne Ehazaya, si n’etiti ụmụ ndị ikom eze, bụ́ ndị a chọrọ igbu, kupụta Jehoash+ nwa Ehazaya na nzuzo, kpọrọkwa ya na nwaanyị na-enye ya ara banye n’ọnụ ụlọ ndina nke dị n’ime, ha wee zoo+ ya ka Atalaya ghara ịhụ ya, e gbughịkwa ya.