20 “Ọ̀ bụ na Ifrem abụghị nwa m hụrụ n’anya na nwa m na-apa apa?+ N’ihi na ruo n’ókè m kwuru okwu megide ya, ruo n’ókè ahụ ka m na-aghaghị icheta ya.+ Ọ bụ ya mere eriri afọ m ji eme mkpọtụ n’ihi ya.+ Aghaghị m inwere ya ọmịiko,”+ ka Jehova kwuru.
7 Ma m ga-emere ụlọ Juda ebere,+ mụ onwe m, bụ́ Jehova Chineke ha, ga-azọpụta ha;+ ma ọ bụghị ụta ma ọ bụ mma agha ma ọ bụ agha ma ọ bụ ịnyịnya ma ọ bụ ndị na-agba ịnyịnya ka m ga-eji zọpụta ha.”+