18 Jehoash eze Juda wee were onyinye niile dị nsọ,+ bụ́ ndị Jehọshafat na Jehoram na Ehazaya bụ́ ndị nna nna ya, bụ́ ndị eze Juda, doro nsọ na onyinye dị nsọ o nyere nakwa ọlaedo niile dị n’ebe a na-edebe akụ̀ n’ụlọ Jehova na n’ụlọ eze, zigara+ Hazel bụ́ eze Siria. O wee hapụ ibuso Jeruselem agha.