23 Jehova wee sị ya: “Mba abụọ nọ gị n’afọ,+ mba abụọ ndị ga-esi n’afọ gị pụta ga-ekewa;+ otu mba ga-aka mba nke ọzọ ike,+ nke okenye ga-ejekwara nke nwata ozi.”+
40 Ọ bụkwa site ná mma agha gị ka ị ga-adị ndụ,+ ị ga-ejekwara nwanne gị nwoke ozi.+ Ma ọ ga-erukwa na, mgbe ị ga-alụ ụ̀lụ̀, ị ga-agbajipụ yok ya n’olu gị.”+