13 Samuel wee were mpi mmanụ+ ahụ tee ya mmanụ n’etiti ụmụnne ya. Mmụọ Jehova wee malite ịkpa ike n’ahụ́ Devid malite n’ụbọchị ahụ gaa n’ihu.+ E mesịa, Samuel biliri laa Rema.+
8 Nke a bụ ihe ị ga-agwa ohu m Devid, ‘Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru: “Mụ onwe m si n’ala ịta ahịhịa, n’ebe ị na-edugharị ìgwè ewu na atụrụ,+ kpọrọ gị ka ị bụrụ onye ndú+ nke ndị m Izrel.