2 Ma ụnyaahụ ma n’oge gara aga+ mgbe Sọl bụ eze anyị, ọ bụ gị na-eduru Izrel apụ ma na-akpọlata ha.+ Jehova wee sị gị, ‘Ọ bụ gị ga-azụ ndị m Izrel dị ka atụrụ,+ ọ bụkwa gị ga-abụ onye ndú+ Izrel.’”
21 Devid wee sị Maịkal: “Ọ bụ n’ihu Jehova, bụ́ onye họọrọ m kama ịhọrọ nna gị na ezinụlọ ya wee mee ka m bụrụ onye ndú+ nke ndị Jehova bụ́ Izrel ka m nọ na-enwe obi ụtọ, m ga-aṅụrịkwa ọṅụ n’ihu Jehova.+
4 Jehova bụ́ Chineke Izrel wee si n’ụlọ nna m+ dum họrọ m ịbụ eze+ Izrel ruo mgbe a na-akaghị aka; n’ihi na ọ bụ Juda ka ọ họọrọ ịbụ onye ndú.+ A bịakwa n’ụlọ Juda, ọ họọrọ ụlọ nna m.+ N’etiti ndị nna m mụrụ,+ o nwere mmasị n’ebe m nọ,+ ime ka m bụrụ eze Izrel dum;