16 Ụmụ otu nwoke onye Kenaịt,+ bụ́ nna nwunye Mozis,+ wee si n’obodo nkwụ pụta,+ ha na ụmụ Juda, gaa n’ala ịkpa Juda, nke dị na ndịda Erad.+ Ha na ndị bi n’ebe ahụ wee biri.+
11 Ma Hiba+ onye Kenaịt kewapụrụ onwe ya n’etiti ndị Kenaịt,+ bụ́ ụmụ Hobab, ọgọ Mozis,+ o wee maa ụlọikwuu ya n’akụkụ nnukwu osisi dị na Zeananim, nke dị na Kidesh.
6 Ka nke a na-eme, Sọl sịrị ndị Kenaịt:+ “Lawanụ,+ pụọnụ, sinụ n’etiti ndị Amalek pụọ, ka m wee ghara ikpochapụ unu na ha. Unu gosiri ụmụ Izrel niile obiọma*+ mgbe ha si n’Ijipt na-apụta.”+ Ndị Kenaịt wee si n’etiti ndị Amalek pụọ.