34 Fero Niko mekwara Elayakim+ nwa Josaya eze n’ọnọdụ Josaya nna ya ma gbanwee aha ya ka ọ bụrụ Jehoyakim. Ọ kpọkwaara Jehoahaz wee kpọta ya n’Ijipt, bụ́ ebe o mesịrị nwụọ.+
5 Jehoyakim+ gbara afọ iri abụọ na ise mgbe ọ malitere ịchị, ọ chịkwara afọ iri na otu na Jeruselem.+ O wee na-eme ihe jọrọ njọ n’anya Jehova bụ́ Chineke ya.+