29 N’ụbọchị Pika eze Izrel, Tiglat-piliza+ eze Asiria+ batara wee weghara Aịjọn+ na Ebel-bet-meaka+ na Janoa na Kidesh+ na Hezọ+ na Gilied+ na Galili,+ ala Naftalaị+ dum, dọrọkwa ha n’agha laa Asiria.+
6 N’afọ nke itoolu nke ọchịchị Hoshia, eze Asiria weghaara Sameria,+ dọrọkwa Izrel n’agha+ laa Asiria ma mee ka ha biri na Hela+ nakwa na Hebọ, nke dị n’akụkụ osimiri Gozan+ nakwa n’obodo dị iche iche nke ndị Midia.+