7 N’ihi ya, ha mere ka Kidesh+ nke dị na Galili n’ógbè Naftalaị bụ́ ugwu ugwu, bụrụ ebe dị nsọ, tinyere Shikem+ nke dị n’ógbè Ifrem bụ́ ugwu ugwu, na Kiriat-aba,+ ya bụ, Hibrọn, n’ógbè Juda bụ́ ugwu ugwu.
9Otú ọ dị, oké ọchịchịrị ahụ agaghị agbachi otú ọ gbachiri mgbe ala a nwere nsogbu, n’oge mbụ mgbe e lelịrị ala Zebulọn na ala Naftalaị+ nakwa mgbe e mesịrị mee ka ọ bụrụ nke a na-asọpụrụ+—ụzọ nke dị n’akụkụ oké osimiri, n’ógbè Jọdan, Galili nke ndị mba ọzọ+.