Joshụa
20 Jehova wee sị Jọshụa: 2 “Gwa ụmụ Izrel, sị, ‘Wepụtaranụ onwe unu obodo mgbaba+ bụ́ ndị m gwara unu banyere ha site n’ọnụ Mozis, 3 ka onye gburu mmadụ,+ bụ́ onye gburu mkpụrụ obi n’amaghị ama, wee gbaga n’ebe ahụ; ọ ga-abụkwara unu ebe mgbaba iji gbanahụ onye ọbọ ọbara.+ 4 Ọ ga-agbagakwa+ n’otu n’ime obodo ndị a ma guzo n’ebe e si abanye n’ọnụ ụzọ ámá+ obodo ahụ wee kwuo ihe o nwere ikwu ná ntị ndị okenye+ obodo ahụ; ha ga-anabatakwa ya n’obodo ahụ ma nye ya ebe ọ ga-ebi. Ọ ga-ebikwa n’etiti ha. 5 Ọ bụrụ na onye ọbọ ọbara ahụ achụwa ya, ha agaghị enyefe onye ahụ gburu mmadụ n’aka ya;+ n’ihi na o gburu mmadụ ibe ya n’amaghị ama, ọ kpọbughị ya asị.+ 6 Ọ ga-ebikwa n’obodo ahụ ruo mgbe ọ ga-eguzo n’ihu nzukọ ka e kpee ya ikpe,+ ruo mgbe nnukwu onye nchụàjà+ nọ n’oge ahụ nwụrụ. Ọ bụ mgbe ahụ ka onye ahụ gburu mmadụ ga-alọghachi,+ ọ ga-abakwa n’obodo ya nakwa n’ụlọ ya, n’obodo ahụ o si gbapụ.’”
7 N’ihi ya, ha mere ka Kidesh+ nke dị na Galili n’ógbè Naftalaị bụ́ ugwu ugwu, bụrụ ebe dị nsọ, tinyere Shikem+ nke dị n’ógbè Ifrem bụ́ ugwu ugwu, na Kiriat-aba,+ ya bụ, Hibrọn, n’ógbè Juda bụ́ ugwu ugwu. 8 N’ógbè Jọdan, n’ebe dị nso na Jeriko, n’ebe ọwụwa anyanwụ, ha si n’ebo Ruben+ wepụta Biza+ nke dị n’ala ịkpa dị larịị, sikwa n’ebo Gad wepụta Remọt+ nke dị na Gilied, sikwa n’ebo Manase wepụta Golan+ nke dị na Beshan.
9 Ọ bụ obodo ndị a ka e wepụtaara ụmụ Izrel niile nakwa onye mbịarambịa nke bi n’etiti ha dị ka onye ọbịa, ka onye ọ bụla gburu mkpụrụ obi n’amaghị ama+ wee gbaga n’ebe ahụ, ka onye ọbọ ọbara ghara igbu ya ruo mgbe o guzoro n’ihu nzukọ ahụ.+