Ọpụpụ 32:20 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 20 O wee buru nwa ehi ahụ ha mere, kpọọ ya ọkụ ma gwerie ya ruo mgbe ọ dị ka ntụ,+ e mesịa, o fesasịrị ya n’elu mmiri+ wee mee ka ụmụ Izrel ṅụọ ya.+ Diuterọnọmi 7:25 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 25 Ị ga-akpọ ihe oyiyi a pịrị apị nke chi ha ọkụ.+ Ka agụụ ọlaọcha na ọlaedo dị na ha ghara ịgụ gị,+ ewerekwala ya,+ ka ọ ghara ịmata gị n’ọnyà;+ n’ihi na ọ bụ ihe arụ+ n’anya Jehova bụ́ Chineke gị. 2 Ndị Eze 19:18 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 18 Ha agbawokwa chi ha ọkụ, n’ihi na ha abụghị chi,+ kama ha bụ ọrụ aka mmadụ,+ osisi na nkume; ha wee bibie ha. 1 Ndị Kọrịnt 10:14 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 14 Ya mere, ndị m hụrụ n’anya, gbaaranụ+ ikpere arụsị ọsọ.+
20 O wee buru nwa ehi ahụ ha mere, kpọọ ya ọkụ ma gwerie ya ruo mgbe ọ dị ka ntụ,+ e mesịa, o fesasịrị ya n’elu mmiri+ wee mee ka ụmụ Izrel ṅụọ ya.+
25 Ị ga-akpọ ihe oyiyi a pịrị apị nke chi ha ọkụ.+ Ka agụụ ọlaọcha na ọlaedo dị na ha ghara ịgụ gị,+ ewerekwala ya,+ ka ọ ghara ịmata gị n’ọnyà;+ n’ihi na ọ bụ ihe arụ+ n’anya Jehova bụ́ Chineke gị.
18 Ha agbawokwa chi ha ọkụ, n’ihi na ha abụghị chi,+ kama ha bụ ọrụ aka mmadụ,+ osisi na nkume; ha wee bibie ha.