11 Jehova, gị onwe gị nwe ịdị ukwuu+ na ike+ na ịma mma+ na ebube+ na nsọpụrụ;+ n’ihi na ihe niile dị n’eluigwe na n’elu ụwa bụ nke gị.+ Jehova, Onye na-emekwa onwe ya ka ọ dị elu dị ka onyeisi nke mmadụ niile,+ ọ bụ gị nwe alaeze.+
17 Ọ bụ ndị nche+ nyere iwu a; ọ bụkwa ndị nsọ kwuru ka e mee ihe a; ka ndị dị ndụ wee mara na Onye Kasị Elu bụ Onye Na-achị Achị n’alaeze ụmụ mmadụ,+ ọ bụkwa onye ọ chọrọ inye ya ka ọ na-enye ya,+ ọ na-emekwa ka onye kasị ala n’etiti ụmụ mmadụ na-achị ya.”+