10 Ma, n’agbanyeghị na ọ dị otú a, ahụwo m ka a na-eli ndị ajọ omume,+ ahụwokwa m otú ha si abata na otú ha si apụ n’ebe nsọ,+ e wee chefuo ha n’obodo nke ha nọ na ya mee ihe ọjọọ.+ Nke a kwa bụ ihe efu.
18 “Ya mere, nke a bụ ihe Jehova kwuru banyere Jehoyakim+ nwa Josaya, bụ́ eze Juda, ‘Ha agaghị akwara ya ákwá arịrị, sị: “Ewoo, nwanne m nwoke! Ewoo, nwanne m nwaanyị!” Ha agaghị akwara ya ákwá arịrị, sị: “Ewoo, nna m ukwu! Ewoo, ùgwù ya!”+