4 Ọ bụ ya wepụrụ ebe ndị dị elu,+ kụrisịa ogidi nsọ+ ma gbutuo ogwe osisi dị nsọ,+ gwerisịakwa agwọ ọla kọpa ahụ+ Mozis mere;+ n’ihi na ruo n’oge ahụ, ụmụ Izrel nọ na-esurere ya ihe nsure ọkụ,+ a nọkwa na-akpọ ya arụsị agwọ ọla kọpa.+
3 O wee matịa ihe yiri aka+ jide m na ntutu isi m. Mmụọ+ wee bulie m bugoo m n’agbata elu ala na eluigwe wee bute m Jeruselem n’ọhụụ Chineke,+ n’ọnụ ụzọ ámá dị n’ime+ nke chere ihu n’ebe ugwu, n’ebe ihe oyiyi ekworo nke na-akpali ikwo ekworo dị.+