10 n’ihi na ị ga-ege ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke gị iji debe ihe o nyere n’iwu na ụkpụrụ ya ndị e dere n’akwụkwọ iwu a,+ n’ihi na ị ga-eji obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum lọghachikwute Jehova bụ́ Chineke gị.+
3 Samuel wee gwa ụlọ Izrel dum, sị: “Ọ bụrụ na unu ji obi unu niile na-alọghachikwute Jehova,+ wepụnụ chi ndị mba ọzọ ndị dị n’etiti unu+ nakwa ihe oyiyi Ashtọret,+ meekwanụ ka obi unu dum dịrị n’ebe Jehova nọ, jeekwaranụ naanị ya ozi,+ ọ ga-anapụtakwa unu n’aka ndị Filistia.”+
4“Izrel, ọ bụrụ na ị chọrọ ịlọghachi,” ka Jehova kwuru, “i nwere ike ịlọghachikwute m.+ Ọ bụrụkwa na i wepụsịa ihe arụ gị n’ihi m,+ ị gaghị abụ onye gbara ọsọ.
7 Malite n’ụbọchị ndị nna nna unu, unu agbakụtawo ụkpụrụ m azụ, unu adịghịkwa edebe ha.+ Lọghachikwutenụ m, m ga-alọghachikwutekwa unu,”+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.