20 O wee ruo na ozugbo Izrel dum nụrụ na Jeroboam alọghachiwo, ngwa ngwa ahụ ha zigara ozi wee kpọọ ya ka ọ bịa nzukọ ha, ha wee mee ya eze Izrel dum.+ Ọ dịghị ebo ọ bụla sooro ụlọ Devid ma e wezụga naanị Juda.+
11Mgbe Rehoboam rutere Jeruselem,+ ọ kpọkọtara ụlọ Juda na Benjamin ozugbo,+ otu narị puku ndị ikom na iri puku asatọ ndị gbasiri ike a họrọ ahọ maka ibu agha,+ ka ha gaa buso Izrel agha iji mee ka Rehoboam nwetaghachi alaeze ahụ.