Diuterọnọmi 20:4 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 4 n’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu so unu na-eje ije iburu unu agha megide ndị iro unu ka o wee zọpụta unu.’+ Joshụa 10:42 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 42 Jọshụa wee nwụde eze ndị a niile na ala ha n’otu mgbe,+ n’ihi na ọ bụ Jehova bụ́ Chineke Izrel bụ onye na-eburu Izrel agha.+ 2 Ihe E Mere 20:15 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 15 O wee sị: “Geenụ ntị, Juda dum na unu ndị bi na Jeruselem, tinyere Eze Jehọshafat! Nke a bụ ihe Jehova gwara unu, ‘Unu atụla egwu,+ unu amakwala jijiji n’ihi nnukwu ìgwè mmadụ a; n’ihi na agha a abụghị nke unu, kama ọ bụ nke Chineke.+ Ndị Rom 8:31 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 31 Gịnịzi ka anyị ga-ekwu banyere ihe ndị a? Ọ bụrụ na Chineke nọnyeere anyị, ònye ga-emegide anyị?+
4 n’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu so unu na-eje ije iburu unu agha megide ndị iro unu ka o wee zọpụta unu.’+
42 Jọshụa wee nwụde eze ndị a niile na ala ha n’otu mgbe,+ n’ihi na ọ bụ Jehova bụ́ Chineke Izrel bụ onye na-eburu Izrel agha.+
15 O wee sị: “Geenụ ntị, Juda dum na unu ndị bi na Jeruselem, tinyere Eze Jehọshafat! Nke a bụ ihe Jehova gwara unu, ‘Unu atụla egwu,+ unu amakwala jijiji n’ihi nnukwu ìgwè mmadụ a; n’ihi na agha a abụghị nke unu, kama ọ bụ nke Chineke.+