Diuterọnọmi 4:28 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 28 N’ebe ahụ, unu ga-efe chi dị iche iche,+ bụ́ ndị aka mmadụ mere, osisi na nkume,+ ndị na-apụghị ịhụ ụzọ ma ọ bụ ịnụ ihe ma ọ bụ iri ihe ma ọ bụ ịnụ ísì.+ 2 Ndị Eze 19:18 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 18 Ha agbawokwa chi ha ọkụ, n’ihi na ha abụghị chi,+ kama ha bụ ọrụ aka mmadụ,+ osisi na nkume; ha wee bibie ha. Abụ Ọma 135:15 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 15 Arụsị mba niile bụ ọlaọcha na ọlaedo,+Ọrụ aka mmadụ.+ Aịzaya 2:8 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 8 Ala ha jupụtakwara na chi na-abaghị uru.+ Ihe aka mmadụ rụrụ ka ha na-akpọrọ isiala, bụ́ ihe mkpịsị aka mmadụ mere.+ Hosia 8:6 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 6 N’ihi na ọ bụ Izrel mere ihe a.+ Ọ bụ omenkà mere ya,+ ọ bụghị Chineke; n’ihi na a ga-akụri nwa ehi Sameria.+
28 N’ebe ahụ, unu ga-efe chi dị iche iche,+ bụ́ ndị aka mmadụ mere, osisi na nkume,+ ndị na-apụghị ịhụ ụzọ ma ọ bụ ịnụ ihe ma ọ bụ iri ihe ma ọ bụ ịnụ ísì.+
18 Ha agbawokwa chi ha ọkụ, n’ihi na ha abụghị chi,+ kama ha bụ ọrụ aka mmadụ,+ osisi na nkume; ha wee bibie ha.
8 Ala ha jupụtakwara na chi na-abaghị uru.+ Ihe aka mmadụ rụrụ ka ha na-akpọrọ isiala, bụ́ ihe mkpịsị aka mmadụ mere.+
6 N’ihi na ọ bụ Izrel mere ihe a.+ Ọ bụ omenkà mere ya,+ ọ bụghị Chineke; n’ihi na a ga-akụri nwa ehi Sameria.+