2 Ndị Eze 23:29 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 29 N’ụbọchị ya, Fero Niko+ eze Ijipt gbagotere wee bịakwute eze Asiria n’akụkụ osimiri Yufretis,+ Eze Josaya wee gaa izute ya;+ ma o gburu Josaya+ na Megido+ ngwa ngwa ọ hụrụ ya. Ilu 3:30 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 30 Gị na mmadụ esela okwu n’efu,+ ma ọ bụrụ na ọ dịghị ihe ọjọọ o mere gị.+ Ilu 26:17 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 17 Onye ọ bụla nke na-agafe agafe, nke na-ewe oké iwe n’esemokwu na-agbasaghị ya, yiri onye na-adọgide nkịta aka ná ntị.+
29 N’ụbọchị ya, Fero Niko+ eze Ijipt gbagotere wee bịakwute eze Asiria n’akụkụ osimiri Yufretis,+ Eze Josaya wee gaa izute ya;+ ma o gburu Josaya+ na Megido+ ngwa ngwa ọ hụrụ ya.
17 Onye ọ bụla nke na-agafe agafe, nke na-ewe oké iwe n’esemokwu na-agbasaghị ya, yiri onye na-adọgide nkịta aka ná ntị.+