14 E nwere ihe efu a na-eme n’ụwa, na e nwere ndị ezi omume ihe na-eme dị ka à ga-asị na ha na-arụ ọrụ ndị ajọ omume,+ e nwekwara ndị ajọ omume ihe na-eme dị ka à ga-asị na ha na-arụ ọrụ ndị ezi omume.+ Asịrị m na nke a kwa bụ ihe efu.
10 Ihe niile ruru gị aka ime, jiri ike gị dum+ mee ha, n’ihi na ọrụ ma ọ bụ ichepụta ihe ma ọ bụ ihe ọmụma+ ma ọ bụ amamihe+ adịghị na Shiol,+ ebe ị na-aga.+