22 Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ụmụ Izrel Sọlọmọn ji mere ohu;+ n’ihi na ọ bụ ha bụ ndị agha na ndị na-ejere ya ozi na ndị o mere ndị isi na ndị na-esote ndị isi agha ya na ndị isi nke ndị na-anya ụgbọ ịnyịnya ya na ndị isi nke ndị na-agba ịnyịnya ya.+
18 O wee mee puku mmadụ iri asaa n’ime ha ndị na-ebu ibu,+ mee puku iri asatọ ndị na-awa nkume+ n’ugwu, meekwa puku mmadụ atọ na narị isii ndị nlekọta ka ha na-ahụ na ndị mmadụ na-arụ ọrụ.+