10 Jehova wee tinye ha n’ọgba aghara n’ihu Izrel,+ ha wee sụọ ha akwụ na Gibiọn+ ma si n’ụzọ e si agbago Bet-horọn chụrụ ha gawa, gburukwa ha ruo Azika+ na Makida.+
30 Zanoa,+ Adọlam+ na ógbè ha niile, Lekish+ na ala ya, Azika+ na obodo nta ya niile. Ha wee maa ụlọikwuu ha malite na Bia-shiba ruo nnọọ na ndagwurugwu Hinọm.+
7 mgbe ndị agha eze Babịlọn nọ na-ebuso Jeruselem na obodo niile fọdụrụ na Juda agha,+ ya bụ, Lekish+ na Azika;+ n’ihi na ọ bụ obodo ndị a, bụ́ obodo ndị e wusiri ike,+ fọdụrụ n’ime obodo niile dị na Juda.+