25 O wee ruo n’abalị ahụ na Jehova gara n’ihu ịsị ya: “Were nwa oké ehi, bụ́ nwa oké ehi nna gị, ya bụ, nwa oké ehi nke abụọ dị afọ asaa, kwatuokwa ebe ịchụàjà Bel+ nke nna gị, gbutuokwa ogwe osisi dị nsọ nke dị ya n’akụkụ.+
4 Ọ bụ ya wepụrụ ebe ndị dị elu,+ kụrisịa ogidi nsọ+ ma gbutuo ogwe osisi dị nsọ,+ gwerisịakwa agwọ ọla kọpa ahụ+ Mozis mere;+ n’ihi na ruo n’oge ahụ, ụmụ Izrel nọ na-esurere ya ihe nsure ọkụ,+ a nọkwa na-akpọ ya arụsị agwọ ọla kọpa.+
6 O sikwa n’ụlọ Jehova bupụta ogwe osisi ahụ dị nsọ,+ buga ya ná mpụga Jeruselem, na ndagwurugwu Kidrọn, wee suo ya ọkụ+ na ndagwurugwu Kidrọn, gweriekwa ya ka ọ ghọọ ntụ ma wụfuo ya n’ebe a na-eli+ ndị nkịtị.