24 n’ihi na unu maara na ọ bụ site n’aka Jehova+ ka unu ga-anata ụgwọ ọrụ kwesịrị ekwesị nke bụ́ ihe nketa ahụ.+ Bụrụnụ ohu nke Nna Ukwu ahụ, bụ́ Kraịst.+
6 Ọ bụrụkwa na okwukwe adịghị,+ ọ gaghị ekwe omume ime ihe dị ya ezi mma,+ n’ihi na onye na-abịaru Chineke nso aghaghị ikwere na ọ dị adị,+ na ọ bụkwa onye na-akwụ ndị na-achọsi ya ike+ ụgwọ ọrụ.+