37 “‘Ndị a bụ ememme a na-emere Jehova n’oge a kara aka+ bụ́ ndị unu ga-akpọsa dị ka mgbakọ dị nsọ,+ maka ịchụrụ Jehova àjà a na-esure n’ọkụ:+ àjà nsure ọkụ+ na àjà ọka+ nke àjà ahụ na àjà ihe ọṅụṅụ,+ dị ka usoro a na-agbaso kwa ụbọchị si dị,
13 Unu ga-ewetakwa ụmụ oké ehi iri na atọ, ebule abụọ, ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ otu afọ, ka ọ bụrụ àjà nsure ọkụ,+ àjà a na-esure n’ọkụ, nke na-esi ísì ụtọ nye Jehova. Ha ga-abụ ndị ahụ́ dị mma.+