17 “Ugbu a, ọ bụrụ na ọ dị eze mma, ka a gaa n’ụlọ akụ̀ eze nke dị na Babịlọn chọpụta+ ma ọ̀ bụ eziokwu na eze Saịrọs nyere iwu+ ka e wughachi ụlọ Chineke nke dị na Jeruselem; ka eze zitekwara anyị ihe o kpebiri banyere ihe a.”
19 Ọ bụrụ na ọ dị eze mma,+ ka eze kwuo ya, ka e denyekwa ya n’iwu+ ndị Peshia na Midia, ka a ghara ịgbanwe ya agbanwe,+ na Vashtaị agaghị abatakwa n’ihu Eze Ahazuirọs; ka eze werekwa ọnọdụ ya dị ka nwunye eze nye nwaanyị ibe ya, onye ka ya mma.