18 Mgbe Jehova nyekwara ha onyeikpe,+ Jehova na-anọnyere onyeikpe ahụ, ọ na-azọpụtakwa ha n’aka ndị iro ha n’ụbọchị niile nke onyeikpe ahụ; n’ihi na ọ na-ewute Jehova+ na ha na-asụ ude n’ihi ndị na-emegbu ha+ na ndị na-akwagharị ha.
9 Ụmụ Izrel wee malite ịkpọku Jehova ka o nyere ha aka.+ Jehova wee nye ụmụ Izrel onye nzọpụta+ ka o wee zọpụta ha, ya bụ, Ọtniel+ nwa Kinaz,+ nwanne Keleb nke nta.+
15 Ụmụ Izrel wee malite ịkpọku Jehova ka o nyere ha aka.+ Jehova wee nye ha onye nzọpụta, ya bụ, Ihọd+ nwa Gira, onye ebo Benjamin,+ onye na-eme aka ekpe.+ Ka oge na-aga, ụmụ Izrel bunyere ya ụtụ ha tụrụ ka ọ gaa bunye Eglọn eze Moab.