Nehemaya 1:3 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 3 Ha wee sị m: “Ndị fọdụrụnụ, ndị fọdụrụ n’ime ndị a dọọrọ n’agha, n’ógbè ahụ a na-achị achị,+ nọ n’ọnọdụ dị oké njọ,+ a na-akọchakwa ha;+ a kwatuwokwa mgbidi+ Jeruselem, gbaakwa ọnụ ụzọ ámá+ ya ọkụ.” Jeremaya 24:9 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 9 m ga-emekwa ka ha ghọọ ihe na-akpata ịma jijiji na ndị ọdachi ga-adakwasị n’alaeze niile nke ụwa,+ meekwa ka ha ghọọ ihe nkọcha na ihe e ji atụ ilu na ihe ịkwa emo+ na ihe a bụrụ ọnụ+ n’ebe niile m ga-achụsasị ha.+ Ezikiel 5:14 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 14 “‘M ga-emekwa ka ị bụrụ ebe a lara n’iyi na ihe nkọcha n’etiti mba ndị gbara gị gburugburu, n’anya ndị niile na-agafe agafe.+
3 Ha wee sị m: “Ndị fọdụrụnụ, ndị fọdụrụ n’ime ndị a dọọrọ n’agha, n’ógbè ahụ a na-achị achị,+ nọ n’ọnọdụ dị oké njọ,+ a na-akọchakwa ha;+ a kwatuwokwa mgbidi+ Jeruselem, gbaakwa ọnụ ụzọ ámá+ ya ọkụ.”
9 m ga-emekwa ka ha ghọọ ihe na-akpata ịma jijiji na ndị ọdachi ga-adakwasị n’alaeze niile nke ụwa,+ meekwa ka ha ghọọ ihe nkọcha na ihe e ji atụ ilu na ihe ịkwa emo+ na ihe a bụrụ ọnụ+ n’ebe niile m ga-achụsasị ha.+
14 “‘M ga-emekwa ka ị bụrụ ebe a lara n’iyi na ihe nkọcha n’etiti mba ndị gbara gị gburugburu, n’anya ndị niile na-agafe agafe.+