42 Fero wee gbapụta mgbaaka ya e ji aka ihe akara+ wee gbanye ya Josef n’aka ma chịrị uwe e ji ákwà linin ọma dụọ yiwe ya, nyawakwa ya ihe olu ọlaedo n’olu.+
19 “Ma otu nwoke+ bara ọgaranya. Ọ na-ejikwa ákwà na-acha odo odo na ákwà linin achọ onwe ya mma, na-emekwa onwe ya obi ụtọ n’ụzọ okomoko site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị.+