Diuterọnọmi 32:36 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 36 N’ihi na Jehova ga-ekpe ndị ya ikpe,+Ọ ga-enwekwa mwute maka ndị ohu ya,+N’ihi na ọ ga-ahụ na ha enwekwaghị enyemaka,Naanị ihe e nwere bụ onye na-enweghị enyemaka na onye na-abaghị n’ihe. 2 Samuel 22:41 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 41 Ị ga-eme ka ndị iro m gbaa ọsọ;+M ga-ebibikwa ndị kpọrọ m oké asị.+ Abụ Ọma 30:11 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 11 Ị gbanwewo iru uju m ka ọ bụrụ ịgba egwú;+Ị tọpụwo ákwà iru uju m kere, i kewo m ọṅụ n’úkwù,+
36 N’ihi na Jehova ga-ekpe ndị ya ikpe,+Ọ ga-enwekwa mwute maka ndị ohu ya,+N’ihi na ọ ga-ahụ na ha enwekwaghị enyemaka,Naanị ihe e nwere bụ onye na-enweghị enyemaka na onye na-abaghị n’ihe.