Abụ olu ụtọ. Abụ e ji rara ụlọ nye.+ Abụ ọma Devid.
30 M ga-eto gị, Jehova, n’ihi na ị dọpụtawo m,+
I kweghịkwa ka ndị iro m ṅụrịa ọṅụ n’ihi ihe mere m.+
2 Jehova Chineke m, m tikuru gị maka enyemaka, i wee gwọọ m.+
3 Jehova, i mewo ka mkpụrụ obi m si na Shiol pụta;+
I debewo m ndụ, ka m wee ghara ịgbada n’olulu.+
4 Unu ndị na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ, bụkuonụ Jehova abụ olu ụtọ,+
Nyenụ aha nsọ ya ekele;+
5 N’ihi na ọ bụ ruo nwa oge ka ọ na-eweso mmadụ iwe,+
Ọ na-emere mmadụ amara n’oge ndụ ya niile.+
Ịkwa ákwá pụrụ ịdị n’anyasị,+ ma o ruo n’ụtụtụ, e nwee mkpu ọṅụ.+
6 Ma mụ onwe m ekwuwo n’oge m tụsaara ahụ́, sị:+
“Ọ dịghị mgbe a ga-eme ka m maa jijiji.”+
7 Jehova, i mewo ka ugwu m guzosie ike n’ihi amara gị.+
I wepụrụ ihu gị; ụjọ wee jide m.+
8 Jehova, ọ bụ gị ka m nọ na-akpọku;+
Ọ bụkwa Jehova ka m nọ na-arịọ ka o meere m amara.+
9 Olee uru ọbara m bara ma m gbadaa n’olulu?+
Ájá ọ̀ ga-eto gị?+ Ọ̀ ga-akọ banyere eziokwu gị?+
10 Jehova, biko, nụrụ, meere m amara.+
Jehova, bụrụ onye na-enyere m aka.+
11 Ị gbanwewo iru uju m ka ọ bụrụ ịgba egwú;+
Ị tọpụwo ákwà iru uju m kere, i kewo m ọṅụ n’úkwù,+
12 Ka ihe niile dị ebube n’ime m wee bụkuo gị abụ olu ụtọ, gharakwa ịgba nkịtị.+
Jehova Chineke m, m ga-eto gị ruo mgbe ebighị ebi.+