2 Samuel 22:28 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 28 Ị ga-azọpụtakwa ndị dị umeala n’obi;+Ma ị na-ele ndị mpako anya ọjọọ, ka i wee weda ha ala.+ Abụ Ọma 18:27 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 27 N’ihi na gị onwe gị ga-azọpụta ndị nọ n’ahụhụ;+Ma ị ga-eweda anya dị mpako ala.+ Ilu 15:25 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 25 Ụlọ nke ndị na-ebuli onwe ha elu ka Jehova ga-etida,+ ma ọ ga-eme ka ókè nke ala nwaanyị di ya nwụrụ dịgide.+ Aịzaya 2:11 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 11 A ga-eme ka anya dị mpako nke mmadụ dịrị ala, a ga-ewedakwa ịdị elu nke ndị mmadụ ala;+ ọ bụkwa naanị Jehova ka a ga-ebuli elu n’ụbọchị ahụ.+ Daniel 4:37 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 37 “Ugbu a, mụ onwe m, Nebukadneza, na-eto ma na-ebuli Eze eluigwe elu, na-ajakwa ya mma,+ n’ihi na ọrụ ya niile bụ eziokwu, ụzọ ya niile bụkwa ikpe ziri ezi,+ nakwa n’ihi na o nwere ike iweda ndị ji mpako na-eje ije ala.”+
25 Ụlọ nke ndị na-ebuli onwe ha elu ka Jehova ga-etida,+ ma ọ ga-eme ka ókè nke ala nwaanyị di ya nwụrụ dịgide.+
11 A ga-eme ka anya dị mpako nke mmadụ dịrị ala, a ga-ewedakwa ịdị elu nke ndị mmadụ ala;+ ọ bụkwa naanị Jehova ka a ga-ebuli elu n’ụbọchị ahụ.+
37 “Ugbu a, mụ onwe m, Nebukadneza, na-eto ma na-ebuli Eze eluigwe elu, na-ajakwa ya mma,+ n’ihi na ọrụ ya niile bụ eziokwu, ụzọ ya niile bụkwa ikpe ziri ezi,+ nakwa n’ihi na o nwere ike iweda ndị ji mpako na-eje ije ala.”+