Job 31:15 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 15 Ọ́ bụghị Onye ahụ kere m n’afọ kere ya,+Ọ́ bụghịkwa otu Onye ahụ kere mụ na ya n’ime afọ? Abụ Ọma 127:3 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 3 Lee! Ụmụ bụ ihe nketa si n’aka Jehova;+Mkpụrụ nke afọ bụ ụgwọ ọrụ.+ Ekliziastis 5:15 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 15 Dị nnọọ ka mmadụ gba ọtọ si n’afọ nne ya pụta, ọtọ ka ọ ga-agbakwa laa,+ dị nnọọ ka ọ gba pụta; ọ dịghịkwa ihe ọ bụla mmadụ pụrụ iwere laa,+ ọ dịghị ihe ọ pụrụ iji laa n’ihi ịrụsi ọrụ ike ya. 1 Timoti 6:7 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 7 N’ihi na ọ dịghị ihe anyị ji bịa n’ụwa, ọ dịghịkwa ihe anyị pụrụ iwere si n’ime ya pụọ.+
15 Dị nnọọ ka mmadụ gba ọtọ si n’afọ nne ya pụta, ọtọ ka ọ ga-agbakwa laa,+ dị nnọọ ka ọ gba pụta; ọ dịghịkwa ihe ọ bụla mmadụ pụrụ iwere laa,+ ọ dịghị ihe ọ pụrụ iji laa n’ihi ịrụsi ọrụ ike ya.