45 N’ihi na ọbụna Nwa nke mmadụ bịara, ọ bụghị ka e jeere ya ozi,+ kama ka o jee ozi, ka o nyekwa mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta+ n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.”+
24 a na-akpọkwa ha ndị ezi omume,+ nke bụ́ onyinye e nyere n’efu,+ site n’obiọma ya na-erughịrị mmadụ site ná ntọhapụ nke si n’ihe mgbapụta+ ahụ Kraịst Jizọs kwụrụ.
30 Ma ọ bụ n’ihi ya ka unu na Kraịst Jizọs ji dị n’otu, bụ́ onye ghọọrọ anyị amamihe+ nke si n’aka Chineke, ghọọkwara anyị ezi omume+ na ịdị nsọ+ na ntọhapụ site n’ihe mgbapụta;+