28 Dị nnọọ ka Nwa nke mmadụ bịara, ọ bụghị ka e jeere ya ozi, kama ka o jee ozi,+ ka o nyekwa mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.”+
30 Ma ọ bụ n’ihi ya ka unu na Kraịst Jizọs ji dị n’otu, bụ́ onye ghọọrọ anyị amamihe+ nke si n’aka Chineke, ghọọkwara anyị ezi omume+ na ịdị nsọ+ na ntọhapụ site n’ihe mgbapụta;+
24 Ya onwe ya buuru mmehie anyị+ n’ahụ́ ya n’elu osisi ahụ,+ ka anyị wee sepụ aka ná mmehie+ ma bie ndụ n’ezi omume. Ọ bụkwa “site n’ọnyá ya ka a gwọrọ unu.”+