61Mmụọ nke Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova dị n’ahụ́ m,+ n’ihi na Jehova etewo m mmanụ+ izi ndị dị umeala n’obi ozi ọma.+ O zitewo m ikechi ọnyá nke ndị e tiwara obi,+ ịkpọsara ndị a dọọrọ n’agha+ na a tọhapụwo ha, na imeghe anya ndị mkpọrọ;+
27 N’agbanyeghị nke ahụ, ma Herọd ma Pọntiọs Paịlet,+ tinyere ndị mba ọzọ na ndị Izrel, zukọtara n’obodo a megide ohu gị dị nsọ,+ bụ́ Jizọs, onye i tere mmanụ,+
38 ya bụ, Jizọs onye Nazaret, otú Chineke si jiri mmụọ nsọ+ na ike tee ya mmanụ, o wee gazuo ala ahụ na-eme ihe ọma ma na-agwọ ndị niile Ekwensu na-emekpọ ọnụ;+ n’ihi na Chineke nọnyeere ya.+