18 Ugwu Saịnaị dum wee na-akwụ anwụrụ ọkụ,+ n’ihi na Jehova ji ọkụ gbadata na ya;+ anwụrụ ọkụ si na ya wee na-akwụgo dị ka anwụrụ ọkụ si n’ekwú ọkụ,+ ugwu ahụ dum nọkwa na-ama jijiji nke ukwuu.+
10 E nwere ọkụ nke na-asọ asọ ka mmiri, nke si n’ihu ya na-asọpụta.+ E nwere puku kwuru puku ndị nọ na-ejere ya ozi,+ nakwa iri puku kwuru iri puku ndị guzo n’ihu ya.+ Ụlọikpe+ ahụ malitere ikpe, a saghekwara akwụkwọ dị iche iche.