8 Ugbu a, unu ekwesila olu ike+ dị ka nna nna unu hà mere. Doonụ onwe unu n’okpuru Jehova,+ bịakwanụ n’ebe nsọ ya+ nke o doworo nsọ+ ruo mgbe a na-akaghị aka wee fee+ Jehova bụ́ Chineke unu, ka iwe dị ọkụ+ ọ na-eweso unu wee dajụọ.
51 “Ndị na-ekwesi olu ike na ndị a na-ebighị úgwù n’obi+ na ná ntị, unu na-eguzogide mmụọ nsọ mgbe niile; dị ka nna nna unu hà mere, otú ahụ ka unu na-eme.+
16 Ndị a bụ ndị na-atamu ntamu,+ ndị na-eme mkpesa banyere ọnọdụ ha ná ndụ, ndị na-agbaso ọchịchọ nke onwe ha,+ ha na-etukwa ọnụ,+ ebe ha na-enwe mmasị n’ihe ndị mmadụ bụ+ n’ihi uru ha ga-erite.