25 Ọ bụrụ na mmadụ emehie mmadụ,+ Chineke ga-ekpechite ọnụ ya;+ ma ọ bụrụ na ọ bụ Jehova ka mmadụ mehiere,+ ònye ga-ekpechitere ya ekpere?”+ Ma ha egeghị nna ha ntị,+ n’ihi na ọ masịrị Jehova ugbu a igbu ha.+
16 Ma ha ji ndị ozi nke ezi Chineke na-eme ihe ọchị,+ na-eledakwa okwu ya anya+ ma na-akwa+ ndị amụma ya emo, ruo mgbe ọnụma+ Jehova bịakwasịrị ndị ya, ruo mgbe ọ na-enweghị ihe ga-egbochi ya.+
3 “Malite n’afọ nke iri na atọ nke ọchịchị Josaya+ nwa Emọn, bụ́ eze Juda, ruo taa, afọ iri abụọ na atọ a, okwu Jehova anọwo na-eru m ntị, m wee na-agwa unu okwu, na-ebili n’isi ụtụtụ na-ekwu okwu, ma unu egeghị ntị.+